Mafee gaa na ọdịnaya

MATIU 2:3-8 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 2:3-8 IGBOB (Bible Nso)

Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile. O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n'ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha. Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n'ihi na otú a ka edeworo ya n'akwukwọ site n'aka onye-amuma, si, Gi Betlehem kwa, ala Juda, I dighi nke-ntà kachasia n'etiti ndi-isi Juda ma-ọli: N'ihi na n'etiti gi ka Onye-isi gāputa, Onye gāzù ndi nkem Israel dika aturu. Mb͕e ahu Herod kpọrọ ha na nzuzo, bú ndi ahu mara ihe, o we juta nke-ọma n'ọnu-ha oge kpakpando ahu nke nāputa ìhè. O we zìe ha je Betlehem, si, Ganu chọputa nke-ọma okwu bayere Nwatakiri ahu; ma mb͕e ọ bula unu gāchọta Ya, bia kọrọm, ka mu onwem we je kwa kpọ isi ala nye Ya.

MATIU 2 IGBOB

MATIU 2:3-8 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ. Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, “ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’” Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.”

MATIU 2 BIU