MATIU 2:3-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 2:3-4 IGBOB (Bible Nso)
Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile. O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n'ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha.
Kekọrịta
MATIU 2 IGBOBMATIU 2:3-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ.
Kekọrịta
MATIU 2 BIU