MATIU 19:16-26
MATIU 19:16-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.” Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha. Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’” Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.” Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe. Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.”
MATIU 19:16-26 Bible Nso (IGBOB)
Ma le, otù onye biakutere Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu ezi ihe gini ka m'gēme, ka m'we nwe ndu ebighi-ebi? Ma Ọ siri ya, Gini mere i nājum ajuju bayere nke bu ezi ihe? Otù Onye di Nke bu ezi Onye: ma ọ buru na i nāchọ ibà nime ndu ahu, debe ihe nile enyere n'iwu. Ọ si Ya, Òle? Jisus we si, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Nwa-okorọbia ahu si Ya, Ihe ndia nile ka m'ribara ama: gini fọdurum ọzọ ime? Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som. Ma mb͕e nwa-okorọbia ahu nuru okwu a, ọ lara na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne. Jisus we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ezie asim unu, Ọ diri ọgaranya ike ibà n'ala-eze elu-igwe. Ọzọ kwa, asim unu, Ọ dikarari camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ibobo nwuru ha n'aru ri nne, ha si, Ònye kwa ka apuru izọputa? Ma Jisus lere ha anya, si ha, N'ebe madu nọ nka bu ihe anāpughi ime; ma apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ.