MATIU 18:9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 18:9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ.
Kesaa
MATIU 18 BIUMATIU 18:9 IGBOB (Bible Nso)
Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, wepu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ.
Kesaa
MATIU 18 IGBOB