Skip to content
Logò Ngwá Baịbụl

MATIU 18:8 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 18:8 IGBOB (Bible Nso)

Ma ọ buru na aka-gi ma-ọbu ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu n'ọlusi ma-ọbu na ngwurọ, kari inwe aka abua ma-ọbu ukwu abua atubà i n'ọku ebighi-ebi.

Kekọrịta
MATIU 18 IGBOB

MATIU 18:8 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi.

Kekọrịta
MATIU 18 BIU