Skip to content
Logò Ngwá Baịbụl

MATIU 18:6-9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 18:6-9 IGBOB (Bible Nso)

ma onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwere na Mu ka ọ ma n'ọnyà, ihe gābara ya urù bu ka ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, ka o mìkpu kwa n'ob͕u oké osimiri. Ahuhu gādiri uwa site n'ihe di iche iche nēme ka madu ma n'ọnyà; n'ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà nēsite n'aka-ya bia. Ma ọ buru na aka-gi ma-ọbu ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu n'ọlusi ma-ọbu na ngwurọ, kari inwe aka abua ma-ọbu ukwu abua atubà i n'ọku ebighi-ebi. Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, wepu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ.

Kekọrịta
MATIU 18 IGBOB

MATIU 18:6-9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya. Ahụhụ ga-adịrị ụwa nʼihi ihe ndị na-eme ka mmadụ jehie. Ihe ndị na-eme ka mmadụ daba nʼọnwụnwa aghaghị ịbịa, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ọ ga-esite nʼaka ya bịa. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi. Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ.

Kekọrịta
MATIU 18 BIU