MATIU 17:27 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 17:27 IGBOB (Bible Nso)
Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.
Kekọrịta
MATIU 17 IGBOBMATIU 17:27 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”
Kekọrịta
MATIU 17 BIU