MATIU 17:14-21 - Compare All Versions
MATIU 17:14-21 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.” Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.” Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ. Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime. Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ.”
MATIU 17:14-21 IGBOB (Bible Nso)
Mb͕e ha biakutere ìgwè madu ahu, otù nwoke we biakute Ya, nēb͕uru Ya ikperè, nāsi kwa, Onye-nwe-ayi, mere nwam nwoke ebere: n'ihi na ọ bu onye ọnwa nēme ka anya ghara idi ya nma, ọ nāhu kwa ahuhu nke-uku: n'ihi na ọtutu mb͕e ọ nādabà n'ọku, ọtutu mb͕e ọ nādabà kwa na miri. M'we kuru ya biakute ndi nēso uzọ-Gi, ma ha apughi ime ka aru-ya di ike. Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya n'ebe a. Jisus we bara ya nba; mọ ọjọ ahu we si nime ya puta: ewe me ka aru nwa-okoro ahu di ike site n'oge hour ahu. Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus iche, si, N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nāpughi ichupu ya? O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime. Ma otú ọ di mọ di otú a apughi iputa ma-ọbughi site n'ekpere na ibu-ọnu.