Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 16:22 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 16:22 IGBOB (Bible Nso)

Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba, si, Chineke mere Gi ebere, Onye-nwe-ayi: ihe a agaghi-adiri Gi ma-ọli.

MATIU 16:22 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!”