MATIU 14:10-14
MATIU 14:10-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ. E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya. Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere. Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala. Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha.
MATIU 14:10-14 Bible Nso (IGBOB)
o we ziga, bipu isi Jọn n'ulo-nkpọrọ. Ewe bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu: o we būru ya nye nne-ya. Ndi nēso uzọ-ya we bia, būru ozu-ya, lì kwa ya; ha we je kọrọ Jisus. Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala. O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike.