MATIU 12:18-21
MATIU 12:18-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka. Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi. Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị, tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie. Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”
MATIU 12:18-21 Bible Nso (IGBOB)
Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara; Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma: M'gātukwasi Ya Mọ nkem, Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé. Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike; Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n'amá. Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia, Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku, Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri. Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.