MATIU 10:40-42
MATIU 10:40-42 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ndị niile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Onye ahụ zitere m ka ha na-anabata. Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume. Ọ bụrụ na onye ọbụla ekunye otu nʼime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nʼihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, nʼezie, asị m unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.”
MATIU 10:40-42 Bible Nso (IGBOB)
Onye nānara unu nke-ọma, ọ bu Mu ka ọ nānara nke-ọma, onye nānara kwa Mu onwem nke-ọma nānara Onye ziterem nke-ọma. Onye nānara onye-amuma nke-ọma n'aha onye-amuma gānara ugwọ-ọlu onye-amuma; onye nānara kwa onye ezi omume nke-ọma n'aha onye ezi omume gānara ugwọ-ọlu onye ezi omume. Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi ntà ndia ṅua n'aha onye nēso uzọm, n'ezie asim unu, ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.