MATIU 10:34-39 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 10:34-39 IGBOB (Bible Nso)
Unu echèla na abiaram itubà udó n'elu uwa: abiaghm itubà udó, kama ọ bu mma-agha. N'ihi na abiaram ikewa nwoke megide nna-ya, na nwa-nwanyi megide nne-ya, na nwunye nwa megide nne di-ya: ọ bu kwa ndi èzí-na-ulo madu gābu ndi-iro-ya. Onye nāhu nna-ya ma-ọbu nne-ya n'anya kari Mu adighi-ekwesim; onye nāhu kwa nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwanyi n'anya kari Mu adighi-ekwesim. Onye nānaraghi kwa obe-ya sokwam n'azu, adighi-ekwesim. Onye chọtara ndu-ya gētufu ya; onye tufu-kwa-ra ndu-ya n'ihim gāchọta ya.
MATIU 10:34-39 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Unu echekwala na m bịara iweta udo nʼụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha. Abịara m ime, “ ‘Ka nwoke megide nna ya, ka nwa nwanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne di ya, ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinaụlọ ya.’ “Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m. Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya.