MATIU 1:17 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 1:17 IGBOB (Bible Nso)
Ya mere ọb͕ọ nile site n'Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ.
Kekọrịta
MATIU 1 IGBOBMATIU 1:17 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.
Kekọrịta
MATIU 1 BIU