MALAKAI 4:4-6
MALAKAI 4:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Chetanụ iwu Mosis, bụ odibo m, ya bụ iwu na ụkpụrụ ndị ahụ dị iche iche m nyere ya na Horeb, maka Izrel niile. “Lee, aga m ezitere unu Ịlaịja onye amụma, tupu ụbọchị ukwu ahụ dị oke egwu bụ ụbọchị ONYENWE ANYị abịa. Ọ ga-eme ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, meekwa ka obi ndị bụ ụmụ chigharịkwutekwa nna ha; ka m ghara ịbịa ma jiri ịbụ ọnụ laa ala ahụ nʼiyi.”
Kesaa
Gụọ MALAKAI 4MALAKAI 4:4-6 Bible Nso (IGBOB)
Chetanu iwu Moses, bú orùm, nke M'nyere ya n'iwu na Horeb inye Israel nile, bú ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche. Le, Mu onwem nēzitere unu Elaija, bú onye-amuma, tutu oké ubọchi ahu di egwu nke Jehova abia. Ọ gēme kwa ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ka obi umu chigharikute kwa ndi bu nna-ha; ka M'we ghara ibia were iwezuga-ka-ebibie-ya tiḅue uwa.
Kesaa
Gụọ MALAKAI 4