MALAKAI 3:8-10
MALAKAI 3:8-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Mmadụ ọ na-ezu ihe bụ nke Chineke nʼohi? Ma unu apụnarịla m ihe bụ nke m. “Ma unu na-ajụ: ‘Anyị si aṅaa na-ezu gị ohi?’ “Ọ bụ site nʼotu ụzọ nʼime ụzọ iri unu, onyinye na aja niile. Nʼihi ya, ọbụbụ ọnụ dịịrị unu, ka mba niile unu ha, nʼihi na ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ezu ohi. Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m,” ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. Ọ bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
MALAKAI 3:8-10 Bible Nso (IGBOB)
Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile. Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile. Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.