MALAKAI 2:14-16
MALAKAI 2:14-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị. Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ. “Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka ONYENWE ANYị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ ONYENWE Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
MALAKAI 2:14-16 Bible Nso (IGBOB)
Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi. Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia. N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.