Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MALAKAI 1:11-14 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MALAKAI 1:11-14 IGBOB (Bible Nso)

N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n'isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì. Unu asiwo kwa, Le, ka o si buru oké ike-ọgwugwu! unu afùwo kwa ya na nlelì, ka Jehova nke ndi-agha siri; unu ewebatawo kwa ihe anapuru n'ike, na ihe gwọrọ ngwuro, na nāria ọria; otú a ka unu webataworo onyinye-inata-iru-ọma: #M'gānara nka nke-ọma nāka-unu? ka Jehova siri. Ma onye anābu ọnu ka onye-nghọḅu ahu bu, nke oké di n'ìgwè aturu-ya, ma ọ nēkwe nkwa, we chuara Onye-nwe-ayi àjà ihe biriri ebibi: n'ihi na eze uku ka M'bu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, aham di kwa egwu n'etiti mba nile.

MALAKAI 1:11-14 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ mgbe unu na-asị na, Tebul Onyenwe anyị bụ ihe e merụrụ emerụ, ebe ihe oriri ya bụkwa ihe nlelị. Unu na-ekwukwa, ‘Nke a bụ ihe ike ọgwụgwụ,’ si otu a na-eduli imi unu elu nʼebe m nọ nʼọnọdụ oke nlelị.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Mgbe unu na-ewebata ihe a natara nʼike, na nke dara ngwụrọ, na nke na-arịa ọrịa, jiri ha chụọrọ m aja, o kwesiri ka m nabata ya?” Ka ONYENWE ANYị na-ekwu. “Onye a na-abụ ọnụ ka onye aghụghọ ahụ bụ nke nwere oke nʼigwe ewu na atụrụ ya, kwee nkwa inye ya, ma mesịa were anụ nwere ntụpọ chụọrọ Onyenwe anyị aja. Nʼihi na mụ onwe m bụ Eze ukwu ahụ,” ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “aha m bụkwa ihe a ga-atụ egwu nʼetiti mba dị iche iche.