LUK 3:4-6
LUK 3:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie. A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị. Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ”
LUK 3:4-6 Bible Nso (IGBOB)
dika edeworo ya n'akwukwọ okwu Aisaia onye-amuma, si, Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie. Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula, Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala; Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi, Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari; Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.