LUK 21:10-15
LUK 21:10-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze. A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe. “Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide.
LUK 21:10-15 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu Ọ siri ha, Mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké ala-ọma-jijiji gādi kwa, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gādi kwa n'ebe di iche iche; ihe di egwu na ihe-iriba-ama uku gādi kwa site n'elu-igwe. Ma mb͕e ihe ndia nile akēmeghi, ha gātukwasi unu aka-ha, sob͕u kwa unu, nārara unu nye n'aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n'ebe anēduputa unu ga n'iru ndi-eze na ndi-isi n'ihi aham. Ọ gāghọrọ unu àmà. Ya mere, zubenu n'obi-unu, na unu agaghi-ebu uzọ tughari uche otú unu gāgọpu onwe-unu: n'ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu.