LUK 2:1-13 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
LUK 2:1-13 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum. (Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.) Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ. Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha. Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru. Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije. Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile. Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị. Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịbama, unu ga-ahụ nwata ọhụrụ e kechiri nʼakwa, dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.” Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị
LUK 2:1-13 IGBOB (Bible Nso)
Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n'ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n'elu-uwa dum madu bi n'akwukwo. Nka bu odide-aha mbu edere mb͕e Kwiriniọs bu onye nāchi Siria. Madu nile we ga ka ede aha-ha n'akwukwọ, onye ọ bula ọ ga obodo nke aka ya. Josef we si kwa na Galili, site n'obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n'obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n'ihi na o si n'ulo na agburu Devid puta; ka o we me ka ede aha ya na Meri n'akwukwọ, bú nwanyi ekwere na ọ gālu, onye di kwa ime. O we rue, mb͕e ha nọ n'ebe ahu, ubọchi-ya zuru ka ọ gāmuta nwa. O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije. Ndi-ọzùzù-aturu di n'otù ala ahu nānọ n'ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n'abali. Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku. Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n'ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile: n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi. Nka gābu-kwa-ra unu ihe-iriba-ama-Ya; Unu gāhu Nwa ọhu ekere n'ákwà ọkiké, nēdina kwa n'ihe anētiye nri anu-ulo. Na mberede ìgwè usu ndi-mọ-ozi nke elu-igwe we nọyere mọ-ozi ahu, nēto Chineke, si