LUK 15:4 - Compare All Versions
LUK 15:4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya?
Kesaa
LUK 15 BIULUK 15:4 IGBOB (Bible Nso)
Òle madu di n'etiti unu, nke nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha funariri ya, nke nārapughi ọgu anọ na iri na iteghete ahu n'ọhia, ga so nke furu efu, rue mb͕e ọ gāchọputa ya?
Kesaa
LUK 15 IGBOB