LUK 12:6-7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
LUK 12:6-7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru. Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
Kesaa
LUK 12 BIULUK 12:6-7 IGBOB (Bible Nso)
Àdighi-ere egwele ise na penny abua? ma adighi-echezọ otù nime ha n'iru Chineke. Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele.
Kesaa
LUK 12 IGBOB