LUK 12:51-53
LUK 12:51-53 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa. Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ. Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.”
Kesaa
Gụọ LUK 12LUK 12:51-53 Bible Nso (IGBOB)
Ùnu nēchè na abiaram inye udo n'uwa? asim unu, É-è; kama nkewa: n'ihi na site n'ub͕u a madu ise ndi kewaworo ekewa gādi n'otù ulo, madu atọ megide madu abua, madu abua megide kwa madu atọ. Agēkewa ha, nna megide nwa-ya nwoke, nwa-nwoke megide kwa nna-ya; nne megide nwa-ya nwanyi, nwa-nwanyi megide kwa nne-ya; nne di megide nwunye nwa-ya, nwunye nwa megide kwa nne di-ya.
Kesaa
Gụọ LUK 12