LUK 1:46-50
LUK 1:46-50 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Kesaa
Gụọ LUK 1LUK 1:46-50 Bible Nso (IGBOB)
Meri we si, Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku, Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam. N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya: N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri. N'ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche; Aha-Ya di kwa nsọ. Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu Ya Rue ọb͕ọ na ọb͕ọ.
Kesaa
Gụọ LUK 1