LEVITIKỌS 6:1-30
LEVITIKỌS 6:1-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị gwara Mosis sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla emehie bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYị, site nʼiduhie onye agbataobi ya banyere ihe e tinyere ya nʼaka idebe, maọbụ izunarị mmadụ ihe, maọbụ iji aghụghọ nara mmadụ ibe ya ihe; maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime. Mgbe ha mehiere nʼụzọ ọbụla nʼime ụzọ ndị a niile, ghọta na ikpe mara ha. Ha aghaghị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ha zuru nʼohi, maọbụ ihe ha pụnara nʼike, maọbụ ihe e nyere ya idebe, ma ọ bụkwanụ ihe ahụ furu efu ọ chọtara, maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya. Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu ONYENWE ANYị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu ONYENWE ANYị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.” ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile. Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ. Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha. Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya. Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’ “ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu ONYENWE ANYị. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị ONYENWE ANYị ezi mma. Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya. Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu ONYENWE ANYị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’ ” ONYENWE ANYị gwakwara Mosis sị, “Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ ONYENWE ANYị nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi. Ha ga-etinye ya mmanụ, ghee ya nʼite. Ị ga-ebubata ya mgbe a gwọkọrọ ya nke ọma, chee ya dịka aja ọka a nyawasịrị anyawasị nke isisi ya dị ONYENWE ANYị ezi mma. Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru ONYENWE ANYị ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam. Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.” ONYENWE ANYị sịrị Mosis, “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu ONYENWE ANYị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya. Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ. A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha. Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.
LEVITIKỌS 6:1-30 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa Moses okwu, si, Mb͕e madu gēmehie, mekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ghọb͕u madu-ibe-ya n'ihe-ndebe, ma-ọbu n'ihe etiyere n'aka-ya, ma-ọbu n'ihe anapuru madu n'ike, ma-ọbu mb͕e ọ meb͕uworo madu-ibe-ya; ma-ọbu mb͕e ọ hutaworo ihe furu efu, o we ghọ aghughọ nime ya, ṅu iyi n'ugha; n'otù nime ihe ndia nile nke madu nēme, nēmehie nime ha: o gēru kwa, mb͕e ọ gēmehie, mb͕e ikpe mara ya, na ọ gēnyeghachi ihe ọ napuru madu n'ike, ma-ọbu ihe ọ nwetara na nmeb͕u, ma-ọbu ihe-ndebe enyere ya idebe, ma-ọbu ihe furu efu nke ọ huta-woro, ma-ọbu ihe ọ bula nke ọ ṅuru iyi bayere ya n'ugha; o gākwughachi kwa ya na nkwuzu-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya: ọ bu onye nwe ihe ahu ka ọ gēnye ya, n'ubọchi àjà-ikpe-ọmuma-ya. Ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè sitere n'ìgwè ewu na aturu, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ọ gēwetara onye-nchu-àjà: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova, agāb͕aghara kwa ya ya; bayere ihe ọ bula nime ihe nile nke ọ nēme, nke ikpe mara ya nime ya. Jehova we gwa Moses okwu, si, Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n'elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya. Onye-nchu-àjà gēyiri kwa uwe-nwuda ákwà ọcha ya, uwe-ukwu ákwà ọcha ya ka o gēyikwasi kwa n'anu-aru-ya; ọ gāchili kwa ntu ahu nke ọku gērechaputa n'àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà, dọba ha na nso ebe-ichu-àjà. O gēyipu uwe-ya, yiri uwe ọzọ, bupu ntu ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, rue ebe di ọcha. Agēme kwa ka ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya, ọ gaghi-anyu anyu; onye-nchu-àjà gēsure nkú ọku n'elu ya kwa-ututu: o gēdo kwa àjà-nsure-ọku n'usoro n'elu ya, sure kwa abuba nke àjà-udo nile ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya. Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu. Nka bu kwa iwu onyinye-inata-iru-ọma: umu-ndikom Eron gēweta ya nso n'iru Jehova, n'iru ebe-ichu-àjà. O gēsite nime ya weju nweju-aka-ya weli, bú site n'utu ọka flour nke onyinye-inata-iru-ọma, site kwa na manu-ya, weli kwa frankincense nile nke di n'elu onyinye-inata-iru-ọma ahu, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà ka ọ buru ihe ísì utọ, dika ihe-ncheta-ya, anēsurere Jehova. Ma ihe fọduru nime ya, Eron na umu-ya ndikom gēri ya: nēkoghi eko ka agēri ya n'ebe di nsọ; n'ogige ulo-ikwū nzute ka ha gēri ya. Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n'àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma. Nwoke ọ bula n'etiti umu Eron gēri ya, dika ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile, site n'àjà-ọku nke Jehova: onye ọ bula nke nēmetu ha aru gādi nsọ. Jehova we gwa Moses okwu, si, Nka bu onyinye iji biaru nso nke Eron na umu-ya ndikom, nke ha gēwetara Jehova nso n'ubọchi etere ya manu; otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-ọma mb͕e dum, nkera-ya n'ututu, nkera-ya kwa n'anyasi. N'ite isi ihe ka agēwere manu me ya; mb͕e ọ deworo edè i gēwebata ya: iberibe achicha esiri esi nke onyinye-inata-iru-ọma ka i gēweta nso ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova. Onye-nchu-aja etere manu nke gānọchi ya site n'umu-ya ndikom gēme ya: ọ bu ukpuru ebighi-ebi Jehova nwere; agēsuresi ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke onye-nchu-àjà ka agēsuresi kwa oku: agaghi-eri ya. Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si, Nka bu iwu àjà-nmehie: n'ebe anēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka agēb͕u ihe àjà-nmehie n'iru Jehova: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu. Onye-nchu-àjà nke nāchu ya bayere nmehie gēri ya; n'ebe di nsọ ka agēri ya, n'ogige ulo ikwū nzute. Ihe ọ bula nke nēmetu anu-ya aru gādi nsọ: mb͕e efesara ufọdu nime ọbara-ya n'uwe ọ bula, i gāsu kwa ihe ahu efesara ya n'elu ya n'ebe di nsọ. Ma agētiwa ihe ájá nke esiri ya nime ya: ma ọ buru na n'ihe ọla ka esiri ya, agēchicha ya, ṅacha ya na miri. Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu. Ọ dighi kwa àjà-nmehie ọ bula agēri, bú nke anēwebata ufọdu nime ọbara-ya n'ulo-ikwū nzute ikpuchi nmehie n'ebe nsọ ahu: agēwere ọku sure ya.