LEVITIKỌS 18:24-30
LEVITIKỌS 18:24-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“ ‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu. Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya. Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu. Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ. Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya. “ ‘Onye ọbụla nʼetiti unu mere ihe arụ ndị a, ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya. Nʼihi ya, lezienụ anya ka unu debe iwu m, ka unu ghara ime ihe arụ ndị a, nke ndị buru unu ụzọ biri nʼala ahụ mere. Ka unu gharakwa imerụ onwe unu site nʼomume arụ ndị a. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu.’ ”
LEVITIKỌS 18:24-30 Bible Nso (IGBOB)
Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu: ala ahu ru-kwa-ra árú: M'nēwere kwa ajọ emume-ya leta ya, ala ahu nāb͕ọputa kwa ndi bi nime ya. Unu onwe-unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, ghara kwa ime ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile; ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu: (n'ihi na ihe-áru ndia nile ka ndikom nke ala ahu meworo, ndi nọ n'iru unu, ala ahu ru-kwa-ra árú;) ka ala ahu we ghara ib͕ọputa unu mb͕e unu nēmeru ya, dika ọ b͕ọputara mba ahu nke di n'iru unu. N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile, agēbipu nkpuru-obi nile nēme ha n'etiti ndi-ha. Unu gēdebe kwa ihe-ndebem, ka unu we ghara ime ihe ọ bula nime ukpuru ihe-árú ndia, nke anēmeri n'iru unu, ka unu we ghara kwa iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.