LEVITIKỌS 18:1-5
LEVITIKỌS 18:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke unu. Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha. Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu. Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha. Abụ m ONYENWE ANYị.
LEVITIKỌS 18:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha. Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova.