Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 13:57-59 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

LEVITIKỌS 13:57-59 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ emesịa pụta ọzọ nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakwa ahụ a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, o gosiri na ọ na-agbasa agbasa. Ihe ọbụla nwere ntụpọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ. Uwe maọbụ ihe a kpara akpa, maọbụ ihe a tụrụ atụ, maọbụ ihe akpụkpọ anụ ọbụla a sara mmiri nke ntụpọ dị na ya pụrụ, a ga-asa ya mmiri ọzọ. Ọ ga-abụkwa ihe dị ọcha.” Ndị a bụ usoro iwu metụtara ntụpọ dịka ntụpọ ọrịa na-efe efe nke dị nʼuwe ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, maọbụ nʼihe a kpara akpa maọbụ nʼihe a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ. Iwu ndị a ga-enye aka ịchọpụta ma ha rụrụ arụ, maọbụ na ha dị ọcha.

LEVITIKỌS 13:57-59 IGBOB (Bible Nso)

Ma ọ buru na anāhu ya n'uwe ub͕u a, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu na nke ihe akpukpọ ọ bula, ihe nāb͕awaputa ka ọ bu: n'ọku ka i gēsure ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya. Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha. Nka bu iwu nke ihe-otiti ekpenta n'uwe aji-anu ma-ọbu nke flax, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, isi na ọ di ọcha, ma-ọbu isi na ọ ruru árú.