ABÙ-ÁKWÁ 3:17-24
ABÙ-ÁKWÁ 3:17-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka ONYENWE ANYị nweta.” Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu. Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m. Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya. Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke ONYENWE ANYị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ. Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike. Mkpụrụobi m na-ekwu, “ONYENWE ANYị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
ABÙ-ÁKWÁ 3:17-24 Bible Nso (IGBOB)
I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma. M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova. Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí. Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem. Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere. O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.