JOSHUA 7:3-10
JOSHUA 7:3-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.” Nʼihi nke a, ihe dịka puku ndị agha atọ ka e zigara imeri obodo Ai. Ma ngwangwa, ndị agha obodo Ai meriri ndị agha ụmụ Izrel, chụọ ha ọsọ. Ihe dịka iri mmadụ atọ na isii nʼetiti ndị agha Izrel ka e gburu nʼagha ahụ. Ndị Ai chụrụ ha ọsọ site nʼụzọ ama obodo ruo nʼebe a na-awa nkume, gbuo ha na mgbada ugwu ahụ. Nʼihi nke a, ndị agha Izrel dara mba, obi lọkwara ha mmiri. Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha. Mgbe ahụ kwa, Joshua sịrị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị! Nʼihi gịnị ka i ji mee ka ndị a gabiga osimiri Jọdan, inyefe anyị nʼaka ndị Amọrait, ime ka ha tigbuo anyị? Ọ gaara adị anyị mma nke ọma ma ọ bụrụ na anyị nọdụrụ nʼofe ọzọ nke Jọdan. Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ? Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?” Ma ONYENWE ANYị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?
JOSHUA 7:3-10 Bible Nso (IGBOB)
Ha we laghachikuru Joshua, si ya, Ka ndi Israel nile ghara irigo; ka ihe ra ka nnù ndikom ise, ma-ọbu ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri, rigo, tib͕ue Ai; emela ka ndi Israel nile dọb͕ue onwe-ha n'ọlu iru ebe ahu; n'ihi na madu ole-na-ole ka ha di. Ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we rigo n'ebe ahu site na ndi Israel: ha we b͕alaga n'iru ndikom Ai. Ndikom Ai we tib͕ue ihe ra ka orú madu na iri na isi sitere na ha: ha we si n'iru ọnu-uzọ-ama chugide ha rue Shebarim, we tib͕ue ha na nrida ahu: obi we lọ ndi Israel miri, we ghọ miri miri. Joshua we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, da kpue iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova rue anyasi, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel; ha we kpokwasi ájá n'isi-ha. Joshua we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova, n'ìhi gini ka I meworo ka ndi nka gabiga Jọdan ma-ọli, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ime ka ayi la n'iyì? ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi kwere we biri n'ofè Jọdan! Biko, Onye-nwe-ayi, gini ka m'gēkwu, mb͕e Israel b͕akutasiri azu-ha n'iru ndi-iro-ha? Ndi Kenean na ndi nile bi n'ala nka gānu kwa ya, we b͕a ayi buruburu, bipu aha-ayi n'uwa: ọ̀ bu kwa gini ka I gēmere aha uku Gi? Jehova we si Joshua, Gi bilie; n'ìhi gini bu nka na i nāda kpu iru-gi n'ala?