JOSHUA 7:24-25
JOSHUA 7:24-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ. Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? ONYENWE ANYị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ.
JOSHUA 7:24-25 Bible Nso (IGBOB)
Joshua, ya na Israel nile, we were Ekan nwa Zera, na ọla-ọcha ahu, na uwe-nwuda ahu, na nkpirikpi ọla-edo ahu, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na ehi-ya, na inyinya-ibu-ya, na ìgwè ewu na aturu-ya, na ulo-ikwū-ya, na ihe nile o nwere: ha we me ka ha rigorue Ndagwurugwu Ekoa. Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n'ọku, were kwa nkume tub͕ue ha.