JOSHUA 7:10-12
JOSHUA 7:10-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ONYENWE ANYị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala? Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye ONYENWE ANYị. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha. Ọ bụ nʼihi nke a mere na ụmụ Izrel enwekwaghị ike iguzo nʼihu ndị iro ha. Ọ bụkwa nke a mere ha ji tụgharịa gbaa ọsọ, nʼihi na ha aghọọla ndị kwesiri ka e bibie. Ya mere, agaghị m anọnyere unu ọzọ, tutu ruo mgbe unu wezugara ma mebie site nʼetiti onwe unu, ihe ọbụla e debere iche maka mbibi.
JOSHUA 7:10-12 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Joshua, Gi bilie; n'ìhi gini bu nka na i nāda kpu iru-gi n'ala? Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha. Umu Israel apughi kwa iguzosi ike n'iru ndi-iro-ha, ha nāb͕akuta azu n'iru ndi-iro-ha, n'ihi na ha aghọwo ihe ewezugara ka ebibie ha: M'gaghi-anọyere unu ọzọ, ma ọ buru na unu ekpochapughi ihe ahu ewezugara nyem n'etiti unu.