JOSHUA 5:4-6
JOSHUA 5:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt. Mgbe ụmụ Izrel niile si Ijipt pụta, e biri ndị nwoke niile nọ nʼetiti ha ugwu. Ma nʼime iri afọ anọ ahụ ha na-awagharị nʼọzara, o nweghị ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ nʼoge a e biri ugwu. Ndị Izrel niile awagharịala nʼọzara iri afọ anọ tutu ruo mgbe ndị ikom niile toruru ije agha, bụ ndị hapụrụ Ijipt nwụchara, ebe ọ bụ na ha jụrụ irubere ONYENWE ANYị isi. Nʼihi na ONYENWE ANYị ṅụrụ iyi sị ha na ha agaghị ahụ ala ahụ anya, bụ ala ahụ o kwere nna nna ha na nkwa, inye anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
JOSHUA 5:4-6 Bible Nso (IGBOB)
Nka bu kwa ihe kpatara Joshua ji bìe úgwù: ndi Israel nile ndi nēsi n'Ijipt puta, ndi bu ndikom, bú ndikom agha nile, nwuru n'ọzara n'uzọ, mb͕e ha siri n'Ijipt puta. N'ihi na ndi ebìri úgwù ka ha bu, bú ndi nile putara n'Ijipt: ma ndi nile amuru n'ọzara n'uzo mb͕e ha siri n'Ijipt puta, ha ebìghi ha úgwù. N'ihi na ọgu arọ abua ka umu Israel jere ije n'ọzara, rue mb͕e mba ahu nile gwusiri, bú ndikom agha ahu ndi nēsi n'Ijipt puta, n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ndi Jehova ṅuru iyi na Ọ gaghi-ekwe ka ha hu ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi na Ọ gēnye ayi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.