JOSHUA 5:1-9
JOSHUA 5:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na ONYENWE ANYị emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel. Ma nʼoge ahụ, ONYENWE ANYị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.” Ya mere, Joshua ji nkume mee mma ntakịrị e ji bie ụmụ Izrel niile ugwu. Ebe a nọ bie ụmụ Izrel ugwu bụ ebe a na-akpọ Gibịat Haaralot. Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt. Mgbe ụmụ Izrel niile si Ijipt pụta, e biri ndị nwoke niile nọ nʼetiti ha ugwu. Ma nʼime iri afọ anọ ahụ ha na-awagharị nʼọzara, o nweghị ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ nʼoge a e biri ugwu. Ndị Izrel niile awagharịala nʼọzara iri afọ anọ tutu ruo mgbe ndị ikom niile toruru ije agha, bụ ndị hapụrụ Ijipt nwụchara, ebe ọ bụ na ha jụrụ irubere ONYENWE ANYị isi. Nʼihi na ONYENWE ANYị ṅụrụ iyi sị ha na ha agaghị ahụ ala ahụ anya, bụ ala ahụ o kwere nna nna ha na nkwa, inye anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. ONYENWE ANYị mere ka ụmụ ndị nnupu isi a mụtara nọchie anya ha. Ọ bụkwa ndị a ka Joshua biri ugwu, nʼihi na tutu ruo ugbu a, e bibeghị ha ugwu. Mgbe e bizuru mba niile ahụ ugwu, ha nọdụrụ nʼebe ahụ ha mara ụlọ ikwu tutu ọnya obibi ugwu ha alaa. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Joshua okwu sị, “Taa, ewezugala m site nʼebe unu nọ ihe nkọcha nke ya na Ijipt so.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Gilgal. Ọ bụkwa aha ya ruo taa.
JOSHUA 5:1-9 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e eze nile nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan n'akuku ọdida-anyanwu, na eze nile nke ndi Kenean, ndi bi n'akuku oké osimiri, nuru na Jehova mereri ka miri Jọdan takọrọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gabigasiri, na obi lọrọ ha miri, mọ adighi kwa nime ha ọzọ, n'ihi umu Israel. Na mb͕e ahu Jehova siri Joshua, Mere onwe-gi mma ọ́mú, bìe umu Israel úgwù ọzọ nke ub͕ò abua. Joshua we mere onwe-ya mma ọ́mu, bìe umu Israel úgwù na Gibeat-ha-aralot. Nka bu kwa ihe kpatara Joshua ji bìe úgwù: ndi Israel nile ndi nēsi n'Ijipt puta, ndi bu ndikom, bú ndikom agha nile, nwuru n'ọzara n'uzọ, mb͕e ha siri n'Ijipt puta. N'ihi na ndi ebìri úgwù ka ha bu, bú ndi nile putara n'Ijipt: ma ndi nile amuru n'ọzara n'uzo mb͕e ha siri n'Ijipt puta, ha ebìghi ha úgwù. N'ihi na ọgu arọ abua ka umu Israel jere ije n'ọzara, rue mb͕e mba ahu nile gwusiri, bú ndikom agha ahu ndi nēsi n'Ijipt puta, n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ndi Jehova ṅuru iyi na Ọ gaghi-ekwe ka ha hu ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi na Ọ gēnye ayi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. Ma umu-ha, ndi O mere ka ha bilie n'ọnọdu ha, ndi ahu ka Joshua biri úgwù: n'ihi na ndi anēbighi úgwù ka ha bu, n'ihi na ha ebìghi ha úgwù n'uzọ. O rue, mb͕e ha bìzuru mba ahu nile úgwù, na ha nọduru n'ọnọdu-ha n'ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e aru-ha di ike. Jehova we si Joshua, Ta ka M'kpochapuworo ihe-ita-uta nke Ijipt n'aru unu. Ewe kpọ aha ebe ahu Gilgal, rue ta.