JOSHUA 4:8-9
JOSHUA 4:8-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụ Izrel mere dịka Joshua gwara ha. Ha buputara nkume iri na abụọ site nʼetiti osimiri Jọdan, dịka ONYENWE ANYị si nye Joshua nʼiwu sị na otu onye, nʼebo Izrel ọbụla, ga-ebuputa otu nkume. Ha buuru nkume iri na abụọ ndị ahụ gaa nʼebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, debe ha nʼebe ahụ. Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
JOSHUA 4:8-9 Bible Nso (IGBOB)
Umu Israel we me otú a, dika Joshua nyere ha iwu, ha we bupu nkume iri na abua n'etiti Jọdan, dika Jehova gwara Joshua okwu, dika ọnu-ọgugu ebo umu Israel si di; ha we bubiga ha n'etiti ha rue ọnọdu-abali-ha, we dọba ha n'ebe ahu. Joshua we guzo nkume iri na abua n'etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n'ebe ahu, rue ta.