JOSHUA 4:23-24
JOSHUA 4:23-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. ONYENWE ANYị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ. O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka ONYENWE ANYị dị ike. O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu ONYENWE ANYị Chineke unu, mgbe niile.”
Kesaa
Gụọ JOSHUA 4JOSHUA 4:23-24 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, mere ka miri Jọdan takọrọ n'iru unu, rue mb͕e unu gabigara, dika Jehova, bú Chineke-unu, mere Oké Osimiri Uhie, nke O mere ka ọ takọrọ n'iru ayi, rue mb͕e ayi gabigara: ka ndi nile nke uwa we mara aka Jehova, na ike ka ọ di; ka ha we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile.
Kesaa
Gụọ JOSHUA 4