Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 22:10-34

JOSHUA 22:10-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ha rutere Gelilọt dị nʼakụkụ Jọdan, nʼala ndị Kenan, ụmụ Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụ aja dị ukwu nʼebe ahụ nʼakụkụ Jọdan. Mgbe ndị Izrel nụrụ na ha e wuola ebe ịchụ aja nʼoke ala Kenan, na Gelilọt, nʼebe dị nso Jọdan, nʼofe ala ndị Izrel, ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo, jikere ịga ibuso ụmụnna ha ahụ agha. Ya mere, ụmụ Izrel zigara Finehaz, nwa Elieza, bụ onye nchụaja ka ọ ga nʼala Gilead, ya bụ ijekwuru ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase. Ndị so Finehaz nʼozi a bụ ndị ndu iri. Otu onyendu sitere nʼotu ebo, nʼime ebo iri nke ụmụ Izrel. Mgbe ndị a rutere nʼala Gilead, ha kpọkọtara ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase gwa ha okwu sị, “Otu a ka ọgbakọ niile nke ONYENWE ANYị sịrị, ‘Olee ụdị njehie dị nke a, nke unu mere megide Chineke? Olee otu unu si wezuga onwe unu site nʼebe ONYENWE ANYị nọ, gaa wuore onwe unu ebe ịchụ aja, si otu a nupu isi megide ya? Ọ pụtara na mmehie Peoa ezubereghị anyị? Ruo taa anyị asachapụbeghị onwe anyị site na mmehie ahụ, ọ bụ ezie nʼọrịa na-efe efe dakwasịrị nzukọ nke ONYENWE ANYị. Ugbu a, unu na-achọkwa isite nʼebe ONYENWE ANYị nọ chigharịa. “ ‘Ọ bụrụ na unu enupu isi megide ONYENWE ANYị taa, matakwanụ na echi ya, ọ ga-eweso nzukọ Izrel niile iwe. Ọ bụrụ na unu wuru ebe ịchụ aja ahụ nʼihi na ala unu rụrụ arụ, bịakwutenụ anyị nʼakụkụ nke ọzọ, nke osimiri a, ebe ONYENWE ANYị bi nʼetiti anyị, nʼime ụlọ nzute obibi ya. Anyị ga-ekenyekwa unu ala anyị. Ma unu enupula isi megide ONYENWE ANYị site nʼiwu ebe ịchụ aja ọzọ, ebe ọ bụ na e nwere otu ebe bụ ezi ebe ịchụ aja nye ONYENWE ANYị Chineke anyị. Mgbe Ekan, nwa Zera, zipụtara onwe ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe metụtara ihe e doro nsọ, ọ bụ na nzukọ Izrel niile esoghị keta oke nʼahụhụ dakwasịrị ya? Ọ bụghị naanị ya nwụrụ nʼihi mmehie ahụ.’ ” Nke a bụ nzaghachi ụmụ Ruben, na ụmụ Gad na ọkara ebo ụmụ Manase, nyere ndị ndu ụmụ Izrel niile; “Chineke onye kachasị chi niile, bụ ONYENWE ANYị! Chineke onye kachasị chi niile, bụ ONYENWE ANYị! Ya onwe ya maara, ka Izrel niile matakwa. A sị na nke a bụ nnupu isi, a sịkwarị na ọ bụ enweghị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYị, unu ahapụla anyị ka anyị dịrị ndụ. Ọ bụrụ na anyị sitere na nnupu isi wuo ebe ịchụ aja a maka ịchụ aja udo maọbụ aja mkpụrụ ọka, ka ONYENWE ANYị nʼonwe ya taa anyị ahụhụ. “Ma nke ahụ abụghị ihe anyị bu nʼobi! Anyị wuru ya nʼihi na anyị tụrụ ụjọ na nʼoge dị nʼihu, ụmụ unu ga-agwa ụmụ anyị okwu sị, ‘Gịnị ka unu na ONYENWE ANYị, Chineke Izrel nwekọrọ? ONYENWE ANYị e jirila osimiri Jọdan kpaa oke nʼetiti anyị na unu, unu ụmụ Ruben na Gad. Unu enweghị oke nʼime ONYENWE ANYị!’ Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu nwere ike ime ụmụ anyị ka ha kwụsị ịtụ egwu ONYENWE ANYị. “Ọ bụ nke a mere anyị ji kpebie sị, ‘Ka anyị jikere wuo ebe ịchụ aja, ma ọ bụghị ebe ịchụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ndị ọzọ,’ Kama, ọ bụ ebe ịchụ aja ịhụba ama nʼetiti unu na anyị, nakwa ọgbọ ndị nke ga-esote anyị, na anyị ga-efe ONYENWE ANYị ofufe nʼụlọnsọ ya, site na ịchụrụ ya aja nsure ọkụ, na aja udo. Mgbe ahụ, nʼoge dị nʼihu, ụmụ ụmụ unu agaghị asị ụmụ ụmụ anyị, ‘Unu enweghị oke nʼime ONYENWE ANYị Chineke.’ “Echiche obi anyị bụ na ọ bụrụ na ụmụ ụmụ unu ekwuo ihe dị otu a, ụmụ anyị ga-azaghachi ha sị, ‘Lee ebe ịchụ aja nna anyị ha wuru, nke yiri ebe ịchụ aja ONYENWE ANYị. E wughị ya maka ịchụ aja nsure ọkụ, kama e wuru ya dịka ihe ama na-egosi nnwekọ dị nʼetiti anyị na unu.’ “Anyị agaghị enupu isi nʼebe ONYENWE ANYị nọ; anyị agaghị esitekwa nʼiso ONYENWE ANYị Chineke wezuga onwe anyị, site nʼiwuru onwe anyị ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka maọbụ ụdị aja ọzọ dị iche iche. Ebe ịchụ aja anyị maara bụ ebe ịchụ aja ONYENWE ANYị Chineke anyị, nke guzo nʼihu ụlọ nzute ya.” Mgbe Finehaz onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ ahụ, bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Izrel nụrụ ihe ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ụmụ Manase kwuru, ọ masịrị ha. Ya mere, Finehaz nwa Elieza, bụ onye nchụaja, sịrị Ruben, na Gad, na Manase, “Taa ka anyị maara na ONYENWE ANYị nọ nʼetiti anyị, nʼihi na unu emehieghị megide ONYENWE ANYị dịka anyị chere. Ya mere, unu azọpụtala ndị Izrel site na mbibi gaara abịakwasị ha site nʼaka ONYENWE ANYị.” Mgbe ahụ Finehaz, nwa Elieza, onye nchụaja, na ndị ndu ahụ laghachitere Kenan site na nzukọ ha na ụmụ Ruben na Gad na ọkara Manase mere nʼala Gilead kọọrọ Izrel ihe ha gatara. Okwu a tọrọ ụmụ Izrel ụtọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ, too Chineke otuto. Ha ekwukwaghị okwu ibu agha megide ụmụ Ruben, ụmụ Gad na ụmụ Manase, banyere ibibi ala ha bi nʼime ya. Ya mere, ụmụ Ruben na ụmụ Gad kpọrọ ebe ịchụ aja ha wuru, “Ebe ịchụ aja akaebe,” nʼihi na ha sịrị, “Ọ bụ ihe akaebe igosi mmadụ niile na ONYENWE ANYị bụkwa Chineke anyị.”

JOSHUA 22:10-34 Bible Nso (IGBOB)

Ha we biarue buruburu-ala Jọdan, nke di n'ala Kenean, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu n'akuku Jọdan, bú ebe-ichu-àjà uku n'ile ya anya. Umu Israel we nu, si, Le, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase ewuwo ebe-ichu-àjà na ncherita-iru ala Kenean, nime buruburu-ala Jọdan, n'ofè umu Israel nwe. Mb͕e umu Israel nuru ya, nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha nime Shailo, irigokuru ha ibu agha. Umu Israel we ziga Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ijekuru umu Reuben, na ijekuru umu Gad, na ijekuru nkera ebo Manase, rue ala Gilead; ya na ndi-isi iri, otù onye-isi otù onye-isi diri ulo nna ọ bula, inọrọ ebo nile nke Israel; ha nile n'otù n'otù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha ka ha bu, ha diri usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel. Ha we biakute umu Reuben, biakute kwa umu Gad, biakute kwa nkera ebo Manase, rue ala Gilead, ha we gwa ha okwu, si, Otú a ka nzukọ nile nke Jehova siri, Gini bu ihe-nmekpu a nke unu mekpuworo megide Chineke Israel, isi n'iso Jehova chigharia ta, n'iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà, inupu isi n'okpuru Jehova ta? Ọ̀ bu na ajọ omume Peoa diri ayi ntà, nke ayi nāsapughi onwe-ayi na ya rue ta, ihe-otiti ahu we si nime nzukọ Jehova, na unu onwe-unu gēsi n'iso Jehova chigharia ta? ọ gēru kwa, ọ buru na unu anupu isi ta n'okpuru Jehova, na Ọ gēwesa nzukọ nile nke Israel iwe echi. Otú ọ di, ọ buru na ala ihe-onwunwe-unu arua árú, gabigaranu onwe-unu rue ala ihe-onwunwe Jehova, ebe ebe-obibi Jehova nēbi, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe n'etiti ayi: ma unu anupula isi n'okpuru Jehova, unu anupu-kwa-la isi n'okpuru ayi, n'iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà nābughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi. Ekan nwa Zera, ọ̀ mekpughi ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova, ma n'aru nzukọ nile nke Israel ka iwe dikwasi? ma ọ bughi nání ya onwe-ya, bú otù onye, kubirì ume n'ajọ omume-ya. Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we za, gwa ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel okwu, si, Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Ya onwe-ya mara, Israel kwa, ya onwe-ya gāmara; ọ buru na ọ bu nime nnupu-isi, ọ buru kwa na ọ bu nime nmekpu megide Jehova, (azọputala ayi ta,) ka ayi wuworo onwe-ayi ebe-ichu-àjà isi n'iso Jehova chigharia; ọ buru kwa na ọ bu isure àjà-nsure-ọku ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma n'elu ya, ọ buru kwa na ọ bu ichu ihe àjà nke àjà-udo n'elu ya, ka Jehova Onwe-ya jua ase ya; ọ buru kwa na ayi emeghi nka site n'iche uche okwu, si, N'ọdi-n'iru umu-unu gāgwa umu-ayi okwu, si, Gini ka unu na Jehova, bú Chineke nke Israel, nwekọrọ? n'ihi na Jehova etiyewo ókè-ala n'etiti ayi na unu, umu Reuben na umu Gad, bú Jọdan; unu enweghi òkè nime Jehova: umu-unu ewe me ka umu-ayi kwusi n'itu egwu Jehova. Ayi we si, Biko, ka ayi doziere onwe-ayi iwu ebe-ichu-àjà nka, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà: kama ihe-àmà ka ọ gābu n'etiti ayi na unu, na n'etiti ọb͕ọ nile nke umu-ayi ndi gānọchi ayi, ka ayi we were àjà-nsure-ọku nile ayi, were kwa àjà nile ayi, were kwa àjà-udo nile ayi, fè òfùfè Jehova n'iru Ya; ka umu-unu we ghara isi umu-ayi n'ọdi-n'iru, Unu enweghi òkè nime Jehova. Ayi we si, O gēru kwa, mb͕e ha gāsi ayi, si kwa ọb͕ọ nile nke umu-ayi n'ọdi-n'iru, otú a, na ayi gāsi, Lenu ihe-atù nke ebe-ichu-àjà Jehova, nke nna-ayi-hà mere, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà: kama ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi na unu. Ya buru ayi ihe-árú inupu isi n'okpuru Jehova, na isi n'iso Jehova chigharia ta, iwu ebe-ichu-àjà isure àjà-nsure-ọku, ma-ọbu inye onyinye-inata-iru-ọma, ma-ọbu ichu àjà, nāgughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, di n'íru ebe-obibi-Ya. Finehas, bú onye-nchu-àjà, na ndi isi nzukọ Israel, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, ndi soro ya je, we nu okwu nile nke umu Reuben na umu Gad na umu Manase kwuru, ọ we di nma n'anya-ha. Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si umu Reuben, si kwa umu Gad, si kwa umu Manase, Ta ka ayi mara na Jehova nọ n'etiti ayi, n'ihi na unu emekpughi ihe-nmekpu a megide Jehova: ub͕u a ka unu naputaworo umu Israel n'aka Jehova. Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi we si n'ebe umu Reuben nọ, na ebe umu Gad nọ, n'ala Gilead, lata, rue ala Kenean, lakuru umu Israel, we weghachiri ha okwu. Okwu ahu we di nma n'anya umu Israel; umu Israel we gọzie Chineke, ha ekwughi kwa okwu irigokuru ha ibu agha, ibibi ala nke umu Reuben na umu Gad nēbi nime ya. Umu Reuben na umu Gad we kpọsa okwu bayere ebe-ichu-àjà ahu, N'ihi na, ka ha kwuru, ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi, na Jehova bu Chineke.