JOSHUA 20:1-6
JOSHUA 20:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Joshua okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha họpụtara onwe unu obodo mgbaba dịka m gwara unu site nʼaka Mosis. Ka obodo ndị a bụrụ ebe onye gburu mmadụ nʼọghọm na-amaghị ama ga-agbaga nʼihi izere ndụ ya site nʼaka onye ahụ ga-achọ ịbọrọ ọbọ ọchụ. Mgbe onye gburu mmadụ ahụ na-amaghị ama gbabara nʼime otu obodo ndị a, ọ ga-eguzo nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ gwa ndị okenye obodo ahụ ihe niile mere. Ndị okenye ahụ ga-akpọbata ya nʼime obodo ahụ, nye ya ebe ọ ga-ebi nʼetiti ha. Ọ bụrụkwa na onye ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ abịa ịbọrọ ọbọ ọchụ ahụ, ndị okenye obodo ahụ agaghị ekwe ka e gbuo onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama, nʼihi na onye ahụ akpachaghị anya mee ihe o mere. Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.”
JOSHUA 20:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa Joshua okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si, Wezugara onwe-unu obodo nb͕abà ahu, nke M'gwara unu okwu bayere ha n'aka Moses: ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n'ọghọm nāmaghi ama we b͕alaga n'ebe ahu: ha gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà ipu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara. Ọ gāb͕alaga kwa n'otù nime obodo ahu, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo ahu, kwue okwu-ya nile na nti ndi-okenye obodo ahu; ha gākpọbata kwa ya n'obodo tiyere onwe-ha, nye ya ọnọdu, ka o we biri n'etiti ha. Ma mb͕e onye-ọ́bọ̀ ọbara gāchu ya n'azu, ha agaghi ekwe ka ob͕u-madu ahu ba n'aka-ya; n'ihi na ọ bu n'amaghi-ama ka o tib͕uru madu-ibe-ya, ma ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga. O gēbi kwa n'obodo ahu, rue mb͕e o gēguzo n'iru nzukọ Israel ka ekpe ya ikpe, rue ọnwu onye-isi-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu: mb͕e ahu ob͕u-madu ahu gālaghachi, ba n'obodo-ya, ba kwa n'ulo-ya, rue obodo ahu nke o si n'ebe ahu b͕alaga.