JOSHUA 2:8-11
JOSHUA 2:8-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha, gwa ha sị, “Ama m na ONYENWE ANYị enyela unu ala a, marakwa na oke ụjọ nke egwu unu adakwasịla anyị, nke mere na ndị niile bi nʼime ala a na-agbaze nʼegwu nʼihi unu, nʼihi na anyị anụla otu ONYENWE ANYị si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ. Ma mgbe anyị nụrụ ihe ndị a, obi anyị gbazere nʼihi ụjọ, mmụọ onye ọbụla dara mba nʼihi unu, nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa.
JOSHUA 2:8-11 Bible Nso (IGBOB)
Ma tutu ha onwe-ha edina ala, nwayi ahu we rigokuru ha n'elu-ulo; ọ si ndikom ahu, Amawom na Jehova enyewo unu ala nka, amawokwam na oké ujọ-unu adakwasiwo ayi, amawokwam na ndi nile nēbi n'ala nka ab͕azewo n'iru unu. N'ihi na ayi anuwo otú Jehova mere ka miri Oké Osimiri Uhie takọrọ n'iru unu, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na ihe unu mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan, bú Saihon na Og, ndi unu wezugara ka ebibie ha. Ma mb͕e ayi nuru ya, obi-ayi we lọ ayi miri, ọ dighi kwa mọ guzoro ọzọ nime nwoke ọ bula, n'ihi unu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu, na n'elu uwa di n'okpuru.