JOSHUA 2:17-21
JOSHUA 2:17-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị, ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile. Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ. Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.” Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.” O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya.
JOSHUA 2:17-21 Bible Nso (IGBOB)
Ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi gābu ndi ikpe nāmaghi n'iyi-gi a nke i meworo ka ayi ṅua. Le, mb͕e ayi onwe-ayi gaje ibata n'ala nka, i gēkegide eriri ogho uhie a nime window nke i ji weda ayi: nna-gi, na nne-gi, na umu-nne-gi, na ulo nna-gi nile, ka i gāchikọta-kwa-ra onwe-gi n'ulo a. Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulo-gi pua n'èzi, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ya, ayi onwe-ayi gābu kwa ndi ikpe nāmagh: ma onye ọ bula gi na ya gānọ n'ulo, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ayi, ma ọ buru na aka ọ bula adikwasi ya. Ma ọ buru na i gosi okwu-ayi nka, ayi gābu kwa ndi ikpe nāmaghi n'iyi-gi nke i meworo ka ayi ṅua. O we si, Dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi. O we zilaga ha, ha we je: o we kegide eriri uhie ahu nime window.