JOSHUA 2:1-6
JOSHUA 2:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ. Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.” Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.” Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa. Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.” (Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)
JOSHUA 2:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu. Ewe gwa eze Jeriko okwu, si, Le, ndikom batara n'ebe a n'abali a sitere n'umu Israel ileputa ala-ayi. Eze Jeriko we zigara Rehab ozi, si, Me ka ha puta, bú ndikom ahu ndi bakutere gi, ndi bara n'ulo-gi: n'ihi na ọ bu ileputa ala nka nile ka ha biaworo. Nwanyi ahu we kuru ndikom abua ahu, zobe ha; o we si, Ọ bu otú a, ndikom ahu bakuterem, ma amaghm ebe ha si bia: o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru. Ma ya onwe-ya mere ka ha rigo n'elu-ulo, o we zobe ha n'ókpòrò flax, nke edoro n'uso nye ya n'elu-ulo.