JOSHUA 17:14-18
JOSHUA 17:14-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ụmụ ụmụ Josef sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na ONYENWE ANYị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.” Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.” Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.” Ma Joshua zara ụmụ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase, sị ha, “Unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị dị ike, ọ bụghị naanị otu oke ka unu ga-eketa, nʼihi na ala ugwu ugwu oke ọhịa ahụ bụkwa nke unu. Sụchaanụ ya, ruo na nsọtụ ya, ka ọ bụrụ nke unu. Ọ bụ ezie na ndị Kenan bi nʼime ya nwere ụgbọ agha igwe, bụrụkwa ndị sịrị ike, unu nwere ike ịchụpụ ha.”
JOSHUA 17:14-18 Bible Nso (IGBOB)
Umu Josef we gwa Joshua okwu, si, Gini mere i nyeworom otù ihe-ife-nzà na otù òkè n'ihe-nketa; ma mu onwem bu ndi bara uba, n'ihi na Jehova agọziwom rue ub͕u a? Joshua we si ha, Ọ buru ndi bara uba ka i bu, rigorue oké ọhia n'onwe-gi, b͕utu-kwa-ra onwe-gi n'ebe ahu n'ala ndi-Perizait na Refaim; ebe ugwu Efraim diri gi nkpa. Umu Josef we si, Ugwu a ezughi ayi: ma ub͕ọ-ala ígwè di n'aka ndi Kenean nile ndi bi n'ala ndagwurugwu, ma ndi bi na Bet-shean na umu-obodo-ya, ma ndi bi na Jezreel. Joshua we gwa ulo Josef, bú Efraim na Manase, okwu, si, Ndi bara uba ka i bu, ọ bu kwa ike uku ka i nwere: i gaghi-enwe nání otù ihe-ife-nzà: n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.