JOSHUA 15:13-19
JOSHUA 15:13-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Dịka iwu ONYENWE ANYị nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak. Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha. O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ. Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa, bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” Ya mere, Otniel, nwa Kenaz, nwa nwanne Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya. Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?” Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
JOSHUA 15:13-19 Bible Nso (IGBOB)
Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n'etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron). Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha. Ọ we si n'ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa. Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye. Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye. O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ? Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.