JOSHUA 13:1-6
JOSHUA 13:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge a, Joshua aghọọla agadi nwoke, ONYENWE ANYị kpọrọ ya sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadi, ụbọchị ọgwụgwụ ndụ gị abịala nso, ma ọtụtụ ala fọdụrụ ndị a ga-emeri. “Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta: “ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile, site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn; nakwa ala ndị Ava, site na ndịda ala ahụ niile dị nʼugwu; nʼala ndị Kenan, na Meara, nke bụ ala ndị Saịdọn, ruo nʼAfek, na oke ala ndị Amọrait; na ala ndị Gebal niile; na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat. “Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu.
JOSHUA 13:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta. Nka bu ala nke fọduru: buruburu-ala nile nke ndi Filistia, na ndi Geshua nile; site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa, site na Ndida: ala nile nke ndi Kenean, na Meara nke ndi Zaidon nwe, rue Efek, rue ókè-ala ndi-Amorait: na ala ndi Gebal, na Lebanon nile, n'ọwuwa-anyanwu, site na Beal-gad n'okpuru ugwu Heamon rue nbata Hemat: ndi nile bi n'ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n'iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n'ihe-nketa, dika M'nyeworo gi iwu.