JOSHUA 1:14-15
JOSHUA 1:14-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka, tutu ruo mgbe ONYENWE ANYị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke ONYENWE ANYị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi ONYENWE ANYị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.”
JOSHUA 1:14-15 Bible Nso (IGBOB)
Ndinyom-unu na umu-ntakiri-unu na anu-ulo-unu gānọdu n'ala ahu nke Moses nyere unu n'ofè Jọdan; ma unu onwe-unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, chiri ihe-ekike-agha, ndi-dike nile, bú dìnkpà, unu gēye-kwa-ra ha aka; rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O meworo unu, ha we nweta, ọbuná ha onwe-ha, ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha: unu we laghachi n'ala nke ihe-nnweta-unu, we nweta ya, bú nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu.