Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 1:10-18

JOSHUA 1:10-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha, “Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ ONYENWE ANYị bụ Chineke na-enye unu.’ ” Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị, “Chetanụ iwu ahụ Mosis odibo ONYENWE ANYị nyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘ONYENWE ANYị Chineke unu na-enye unu izuike. O nyekwala unu ala a.’ Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka, tutu ruo mgbe ONYENWE ANYị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke ONYENWE ANYị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi ONYENWE ANYị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.” Mgbe ahụ, ha zara Joshua, “Ihe ọbụla nke ị nyere anyị nʼiwu anyị ga-eme ha, ebe ọbụla i zigara anyị ka anyị ga-aga. Anyị ga-ege gị ntị dịka anyị si gee Mosis ntị. Ka ONYENWE ANYị Chineke gị nọnyere gị dịka o si nọnyere Mosis. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu i nyere anyị, ọ ga-anwụ. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.”