JOSHUA 1:1-6
JOSHUA 1:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Mosis, bụ odibo ONYENWE ANYị nwụrụ, ONYENWE ANYị gwara Joshua nwa Nun, onye na-enyere Mosis aka okwu sị, “Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel. Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu. Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ. Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ. Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie.
JOSHUA 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e ọnwu Moses, bú orù Jehova, gasiri, na Jehova gwara Joshua nwa Nun, bú onye nējere Moses ozi, okwu, si, Moses, bú orùm anwuruwo; ma ub͕u a bilie, gabiga Jọdan nka, gi onwe-gi, na ndi nke a nile, rue ala ahu nke Mu onwem nēnye ha, bú umu Israel. Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi, unu ka M'nyeworo ya, dika M'gwara Moses okwu. Site n'ọzara, na Lebanon nka, we rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis, ala nile nke ndi Het, we rue oké osimiri chere iru n'ọdida-anyanwu, ka ókè-ala unu gādi. Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-ara gi aka, M'gaghi-arapu kwa gi. Idi ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha.