JOEL 2:28-30 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JOEL 2:28-30 IGBOB (Bible Nso)
O gēru kwa ma emesia, na M'gāwusa Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù: e, ọbuná n'aru ndi-orù ndikom na n'aru ndinyom nēje ozi ka M'gāwusa Mọm na mb͕e ahu. M'gēnye kwa ihe-ebube di iche iche n'elu-igwe na n'uwa: ọbara, na ọku, na ogidi nke anwuru-ọku.
Kesaa
JOEL 2 IGBOBJOEL 2:28-30 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị. Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.
Kesaa
JOEL 2 BIU