Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 9:4-14 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

JOB 9:4-14 IGBOB (Bible Nso)

O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike: Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo? Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya, Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya. Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya, Ogidi-ya nile we ma jijiji. Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa; Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà. Onye nání Ya nēseti elu-igwe, Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu. Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades, Na ime-ulo nke Ndida. Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi; Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi. Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya: Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya. Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu? Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme? Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi; Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya. Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya, Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?

JOB 9:4-14 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ? Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya. Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji. Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye. Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri. Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe. Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta. Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya. Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’ Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya. “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?